Psalms 54

Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?”

Ekpere maka nchebe

1O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;
jirikwa ike gị kpepụta m.
2O Chineke, nụrụ ekpere m;
gee ntị nʼokwu ọnụ m.

3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;
ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,
ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela

4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;
onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

5Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;
nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.

6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;
O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
7Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,
ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.
Copyright information for IboBIU